2 Corinthians 7

1Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke.

Ihe na-enye Pọl obi ụtọ

2Megheenụ obi unu nabata anyị, nʼihi na o nweghị onye ọbụla nʼetiti unu anyị mere ihe ọjọọ. O nwekwaghị onye anyị duhiere. Ọ dịkwaghị onye ọbụla anyị rigburu. 3Anaghị m ekwu ihe ndị a ka m maa unu ikpe, dịka m kwuburu na mbụ, na anyị bu unu nʼobi anyị, ịdịkọ ndụ, maọbụ ịnwụkọkwa ọnwụ nʼotu. 4Nkwuwa okwu m ji gwa unu okwu dị ukwuu; ịnya isi m nʼihi unu dịkwa ukwuu. Abụ m onye a gbara ume nʼebe ọ dị ukwu, nʼime ọnọdụ ahụhụ anyị niile, ana m aṅụrịbiga ọṅụ oke.

5Nʼihi na mgbe anyị batara Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nʼaka nri na aka ekpe bịakwute anyị, ọgụ nʼezi, egwu nʼime. 6Ma otu ọ dị, Chineke, onye na-agba ndị ike gwụrụ ume, gbara anyị ume site nʼọbịbịa Taịtọs. 7Ọ bụkwaghị naanị nʼihi na ọbịbịa ọ bịara nyere anyị obi ụtọ, kama akụkọ o ji bịa, gbasara otu unu si gbaa ya ume, gwakwa anyị otu unu si na-ele anya ịhụ m, na otu unu si na-eru ụjụ nʼihi ihe niile mere, na otu unu si guzosie ike nʼukwu m, na ụdị ịhụnanya unu nwere nʼebe m nọ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu.

8Ọ naghị ewutekwa m ugbu a na m deere unu akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na o wutere m mgbe ahụ m na-ede ya, nʼihi na amaara m na ọ ga-ewetara unu obi ọjọọ mgbe unu gụrụ ya. Ma obi ọjọọ ahụ abụrụla naanị nke nwa oge nta. 9Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nʼihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nʼihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nʼihi akwụkwọ anyị deere unu. 10Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ. 11Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nʼihe mwute dakwasịrị unu. Ugbu a, unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nʼobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwanụ otu unu si mee ihe niile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nʼokwu ndị a niile. 12Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nʼihi onye ahụ mehiere, maọbụ nʼihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Chineke gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nʼobi. 13Nʼụzọ niile ndị a, anyị bụ ndị a gbara ume site nʼịhụnanya unu nwere nʼebe anyị nọ.

A gbara anyị ume karịa site na ịhụ ọṅụ Taịtọs nʼihi nnabata unu nabatara, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu.
14Nʼihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyara m isi nʼihu ya banyere unu; ugbu a, obi dị m ụtọ nke ukwuu nʼihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a, ịnya isi m nʼebe Taịtọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu. 15Ugbu a, ịhụnanya o nwere nʼebe unu nọ na-aba ụba nke ukwuu, nʼihi ncheta ọ na-echeta otu unu niile si jiri ọṅụ gee ya ntị na otu unu si jiri ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji nabata ya. 16Nke a na-enyekwa m obi ụtọ nʼihi na enwere m ntụkwasị obi nʼebe unu nọ nʼime ihe niile.

Copyright information for IboBIU